20Mosis kpọọrọ nwunye ya, na ụmụ ya ndị ikom, nọkwasị nʼelu ịnyịnya ibu, laghachi nʼala Ijipt. O jikwa mkpanaka Chineke ahụ nʼaka ya.
21Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Mgbe i ruru Ijipt, hụ na ị gara nʼihu Fero mee ihe ebube niile m nyere gị ike ime. Ma aga m eme ka obi ya sie ike, ka ọ ghara ikwe ka ndị m laa.
22Ị ga-agwa Fero okwu sị ya, ‘Nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, Izrel bụ Ọkpara m.
23Agwara m gị okwu sị, “Hapụ nwa m nwoke ka o si nʼala Ijipt pụọ gaa ebe ọ ga-anọ fee m ofufe,” ma ị jụrụ ajụ. Ugbu a aga m egbu ọkpara gị.’ ”
24Mgbe Mosis na ezinaụlọ ya na-alaghachi Ijipt, ha rutere ebe ha ga-ezu ike abalị. Nʼebe ahụ, Onyenwe anyị bịakwutere Mosis chọọ igbu ya.