12“Kpọbata Erọn na ụmụ ya ndị ikom nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Jiri mmiri saa ha ahụ nʼebe ahụ.
13Yikwasị Erọn uwe nsọ ya. Tekwaa ya mmanụ, ido ya nsọ maka i jere m ozi dịka onye nchụaja.
14Mekwaa ka ụmụ ya ndị ikom bịaruo nso, yikwasịkwa ha uwe ime ahụ.
15Tee ha mmanụ dịka i si tee nna ha, ime ka ha bụrụ ndị na-ejere m ozi dịka ndị nchụaja. Otite mmanụ ha ga-abụ nye ọrụ nchụaja ha nke ga-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.”
16Mosis mezuru ihe niile dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu ime.