10Mgbe ahụ, tee ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ahụ mmanụ ya na ihe ya niile e ji eje ozi. Doo ebe ịchụ aja ahụ nsọ, ọ ga-abụkwa ebe dịkarịsịrị nsọ.
11Tekwaa efere ukwu ịsa mmiri ahụ na ụkwụ ya mmanụ. Doo ha nsọ.
12“Kpọbata Erọn na ụmụ ya ndị ikom nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Jiri mmiri saa ha ahụ nʼebe ahụ.
13Yikwasị Erọn uwe nsọ ya. Tekwaa ya mmanụ, ido ya nsọ maka i jere m ozi dịka onye nchụaja.
14Mekwaa ka ụmụ ya ndị ikom bịaruo nso, yikwasịkwa ha uwe ime ahụ.