Ọpụpụ 40

Mgbe ahụ, tee ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ahụ mmanụ ya na ihe ya niile e ji eje ozi. Doo ebe ịchụ aja ahụ nsọ, ọ ga-abụkwa ebe dịkarịsịrị nsọ.

Exodus 40:10 (UKJV) And you shall anoint the altar of the burnt offering, and all his vessels, and sanctify the altar: and it shall be an altar most holy.

8Guzobe ogige gburugburu ụlọ nzute ahụ. Konyekwa akwa mgbochi nʼọnụ ụzọ ogige ahụ.

9“Were mmanụ nsọ ahụ tee ụlọ nzute ahụ, ya na ihe niile dị nʼime ya, si otu a doo ha nsọ ma ngwongwo ịchọ mma ya niile. Ọ ga-abụ ebe dị nsọ.

10Mgbe ahụ, tee ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ahụ mmanụ ya na ihe ya niile e ji eje ozi. Doo ebe ịchụ aja ahụ nsọ, ọ ga-abụkwa ebe dịkarịsịrị nsọ.

11Tekwaa efere ukwu ịsa mmiri ahụ na ụkwụ ya mmanụ. Doo ha nsọ.

12“Kpọbata Erọn na ụmụ ya ndị ikom nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Jiri mmiri saa ha ahụ nʼebe ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.