Ọpụpụ 40

Mosis dọnyere tebul ahụ nʼakụkụ ugwu nke ụlọ nzute ahụ, na mpụta nke akwa mgbochi ahụ.

Exodus 40:22 (UKJV) And he put the table in the tent of the congregation, upon the side of the tabernacle northward, without the vail.

20O tinyere Ihe Ama nʼime igbe ọgbụgba ndụ ahụ. Emesịa, ọ tụkwasịkwara mkpara e ji ebu igbe ahụ nʼakụkụ igbe ahụ, were okwuchi igbe ahụ, nke bụ Oche Ebere ahụ, kpuchie igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ.

21Emesịa, o bubatara igbe ahụ nʼime ụlọ nzute ahụ, kwụnyekwa akwa mgbochi nke mgbochi, kewapụ igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ, dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.

22Mosis dọnyere tebul ahụ nʼakụkụ ugwu nke ụlọ nzute ahụ, na mpụta nke akwa mgbochi ahụ.

23Ọ dọkwasịrị achịcha ahụ a na-edo nʼihu Onyenwe anyị nʼelu tebul ahụ, dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.

24Ọ dọkwasịrị ihe ịdọba oriọna ahụ nʼime ụlọ nzute nʼakụkụ tebul ahụ, nʼakụkụ ndịda nke ụlọ nzute ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.