Ọpụpụ 40

Mosis guzobere ogige ahụ gburugburu ụlọ nzute ahụ na ebe ịchụ aja ahụ. O konyekwara akwa mgbochi nʼụzọ mbata nke ogige ụlọ nzute ahụ. Otu a, Mosis rụzuru ọrụ niile ahụ.

Exodus 40:33 (UKJV) And he reared up the court round about the tabernacle and the altar, and set up the hanging of the court gate. So Moses finished the work.

31Mosis, na Erọn, na ụmụ ya ndị ikom na-eji ya akwọcha aka ha, sakwaa ụkwụ ha.

32Mgbe ọbụla ha na-abanye nʼụlọ nzute na mgbe ha na-abịa nso ebe ịchụ aja, ha na-asacha, dịka Onyenwe anyị nyere ya Mosis nʼiwu.

33Mosis guzobere ogige ahụ gburugburu ụlọ nzute ahụ na ebe ịchụ aja ahụ. O konyekwara akwa mgbochi nʼụzọ mbata nke ogige ụlọ nzute ahụ. Otu a, Mosis rụzuru ọrụ niile ahụ.

34Mgbe ahụ, igwe ojii kpuchiri ụlọ nzute ahụ, ebube Onyenwe anyị jupụtakwara nʼime ya.

35Mosis nʼonwe ya enweghị ike ịbanye nʼime ụlọ nzute ahụ nʼihi igwe ojii kpuchiri elu ya na ebube Onyenwe anyị jupụtara nʼụlọ nzute ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.