Ọpụpụ 40

Mosis nʼonwe ya enweghị ike ịbanye nʼime ụlọ nzute ahụ nʼihi igwe ojii kpuchiri elu ya na ebube Onyenwe anyị jupụtara nʼụlọ nzute ahụ.

Exodus 40:35 (UKJV) And Moses was not able to enter into the tent of the congregation, because the cloud abode thereon, and the glory of the LORD filled the tabernacle.

33Mosis guzobere ogige ahụ gburugburu ụlọ nzute ahụ na ebe ịchụ aja ahụ. O konyekwara akwa mgbochi nʼụzọ mbata nke ogige ụlọ nzute ahụ. Otu a, Mosis rụzuru ọrụ niile ahụ.

34Mgbe ahụ, igwe ojii kpuchiri ụlọ nzute ahụ, ebube Onyenwe anyị jupụtakwara nʼime ya.

35Mosis nʼonwe ya enweghị ike ịbanye nʼime ụlọ nzute ahụ nʼihi igwe ojii kpuchiri elu ya na ebube Onyenwe anyị jupụtara nʼụlọ nzute ahụ.

36Nʼime njegharị ha niile, mgbe ọbụla igwe ojii ahụ si nʼelu ụlọ nzute ahụ bilie, mgbe ahụ ka ụmụ Izrel na-ebuli njem.

37Ma ọ bụrụ na igwe ojii ahụ ebilighị, ụmụ Izrel adịghị ebulikwa njem tutuu ruo mgbe o biliri.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.