Ọpụpụ 40

Ma ọ bụrụ na igwe ojii ahụ ebilighị, ụmụ Izrel adịghị ebulikwa njem tutuu ruo mgbe o biliri.

Exodus 40:37 (UKJV) But if the cloud were not taken up, then they journeyed not till the day that it was taken up.

35Mosis nʼonwe ya enweghị ike ịbanye nʼime ụlọ nzute ahụ nʼihi igwe ojii kpuchiri elu ya na ebube Onyenwe anyị jupụtara nʼụlọ nzute ahụ.

36Nʼime njegharị ha niile, mgbe ọbụla igwe ojii ahụ si nʼelu ụlọ nzute ahụ bilie, mgbe ahụ ka ụmụ Izrel na-ebuli njem.

37Ma ọ bụrụ na igwe ojii ahụ ebilighị, ụmụ Izrel adịghị ebulikwa njem tutuu ruo mgbe o biliri.

38Igwe ojii Onyenwe anyị ahụ na-anọgide nʼelu ụlọ nzute ahụ nʼehihie ma nʼabalị, ọkụ na-esi nʼime ya na-enwupụta. Ndị Izrel niile na-ahụkwa ya anya ụbọchị niile nke ha jegharịrị nʼọzara.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.