36Nʼime njegharị ha niile, mgbe ọbụla igwe ojii ahụ si nʼelu ụlọ nzute ahụ bilie, mgbe ahụ ka ụmụ Izrel na-ebuli njem.
37Ma ọ bụrụ na igwe ojii ahụ ebilighị, ụmụ Izrel adịghị ebulikwa njem tutuu ruo mgbe o biliri.
38Igwe ojii Onyenwe anyị ahụ na-anọgide nʼelu ụlọ nzute ahụ nʼehihie ma nʼabalị, ọkụ na-esi nʼime ya na-enwupụta. Ndị Izrel niile na-ahụkwa ya anya ụbọchị niile nke ha jegharịrị nʼọzara.