Ọpụpụ 5

Emesịa, Mosis na Erọn jekwuuru Fero guzo nʼihu ya gwa ya okwu sị, “Ihe a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, ‘Hapụ ndị m ka ha gaa meere m mmemme dị nsọ nʼime ọzara.’ ”

Exodus 5:1 (UKJV) And afterward Moses and Aaron went in, and told Pharaoh, Thus says the LORD God of Israel, Let my people go, that they may hold a feast unto me in the wilderness.

1Emesịa, Mosis na Erọn jekwuuru Fero guzo nʼihu ya gwa ya okwu sị, “Ihe a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, ‘Hapụ ndị m ka ha gaa meere m mmemme dị nsọ nʼime ọzara.’ ”

2Fero zara sị, “Onye ka Onyenwe anyị bụ m ga-eji gee ntị nʼolu ya ịhapụ ụmụ Izrel ka ha si nʼebe a pụọ? Amaghị m onye ọ bụ, agaghị m ekwekwa ka Izrel gaa ebe ọbụla.”

3Ha zara sị, “Chineke ndị Hibru zutere anyị. Biko kwere ka anyị gaa njem ụbọchị atọ nʼime ọzara nọọ nʼebe ahụ chụọrọ Onyenwe anyị Chineke anyị aja. Ọ bụrụ na anyị ajụ ige ntị nʼolu ya, ọ ga-eji ọrịa ọjọọ maọbụ mma agha kpochapụ anyị.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.