9Nyenụ ha ọrụ dị ike, nke ga-ezi ha na ha ekwesighị ịṅa ntị nʼokwu ụgha Mosis na Erọn na-ekwuru ha.”
10Ndị na-achị ndị ohu na ndị nlekọta jekwuuru ụmụ Izrel sị ha, “Ihe a ka Fero kwuru: ‘Agaghị m enyekwa unu ahịhịa ọzọ.
11Gaanụ chọtara onwe unu okporo ahịhịa ebe ọbụla unu nwere ike ịchọta ya, ma nke a agaghị eme ka e gbubilata ọrụ unu kwesiri ịrụ.’ ”
12Ya mere ndị ha gbasasịrị nʼala Ijipt niile ịchịkọta okporo ahịhịa ha ji akpụ brik.
13Ndị na-achị ha nọgidere na-akwagide ha sị ha, “Rụchaanụ ọrụ unu kwesiri ịrụ nʼụbọchị dịka unu si arụ ya mgbe a na-enye unu ahịhịa.”