8Ọzọ, meenụ ka ọnụọgụgụ brik ha na-akpụ dịrị ka ọ dị na mbụ, unu emela ka ọ dịrị ala. Ha bụ ndị umengwụ. Ọ bụ ya mere ha ji na-eti mkpu, ‘Ka anyị gaa nʼọzara gaa chụọrọ Chineke anyị aja.’
9Nyenụ ha ọrụ dị ike, nke ga-ezi ha na ha ekwesighị ịṅa ntị nʼokwu ụgha Mosis na Erọn na-ekwuru ha.”
10Ndị na-achị ndị ohu na ndị nlekọta jekwuuru ụmụ Izrel sị ha, “Ihe a ka Fero kwuru: ‘Agaghị m enyekwa unu ahịhịa ọzọ.
11Gaanụ chọtara onwe unu okporo ahịhịa ebe ọbụla unu nwere ike ịchọta ya, ma nke a agaghị eme ka e gbubilata ọrụ unu kwesiri ịrụ.’ ”
12Ya mere ndị ha gbasasịrị nʼala Ijipt niile ịchịkọta okporo ahịhịa ha ji akpụ brik.