Ọpụpụ 5

Mgbe ahụ, ndịisi ọrụ ndị Izrel bịakwutere Fero kwaara ya akwa sị ya, “Gịnị mere i ji si otu a na-emeso ndị ohu gị mmeso?

Exodus 5:15 (UKJV) Then the officers of the children of Israel came and cried unto Pharaoh, saying, Wherefore deal you thus with your servants?

13Ndị na-achị ha nọgidere na-akwagide ha sị ha, “Rụchaanụ ọrụ unu kwesiri ịrụ nʼụbọchị dịka unu si arụ ya mgbe a na-enye unu ahịhịa.”

14Ndịisi ọrụ Fero malitere iti ndị Izrel ha họpụtara maka inyere ha aka ilekọta ndị ọrụ ihe, na-ajụ ha ajụjụ sị, “Gịnị mere unu akpụtaghị oke ọnụọgụgụ brik unu kwesiri ịkpụta ụnyaahụ maọbụ taa?”

15Mgbe ahụ, ndịisi ọrụ ndị Izrel bịakwutere Fero kwaara ya akwa sị ya, “Gịnị mere i ji si otu a na-emeso ndị ohu gị mmeso?

16Ọ dịghị okporo ahịhịa a na-enye ndị ohu gị, ma ha na-asị anyị, ‘Kpụọnụ brik!’ A na-etikwa ndị ohu gị ihe, ma ịta ụta ekwesighị ịdịrị anyị kama ịta ụta dịrị ndị gị.”

17Fero zaghachiri ha sị, “Ndị umengwụ! Nʼezie ndị umengwụ ka unu bụ. Ọ bụ ya mere unu ji nọgide na-asị, ‘Ka anyị gaa chụọrọ Onyenwe anyị aja.’

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.