Ọpụpụ 5

Fero zaghachiri ha sị, “Ndị umengwụ! Nʼezie ndị umengwụ ka unu bụ. Ọ bụ ya mere unu ji nọgide na-asị, ‘Ka anyị gaa chụọrọ Onyenwe anyị aja.’

Exodus 5:17 (UKJV) But he said, All of you are idle, all of you are idle: therefore all of you say, Let us go and do sacrifice to the LORD.

15Mgbe ahụ, ndịisi ọrụ ndị Izrel bịakwutere Fero kwaara ya akwa sị ya, “Gịnị mere i ji si otu a na-emeso ndị ohu gị mmeso?

16Ọ dịghị okporo ahịhịa a na-enye ndị ohu gị, ma ha na-asị anyị, ‘Kpụọnụ brik!’ A na-etikwa ndị ohu gị ihe, ma ịta ụta ekwesighị ịdịrị anyị kama ịta ụta dịrị ndị gị.”

17Fero zaghachiri ha sị, “Ndị umengwụ! Nʼezie ndị umengwụ ka unu bụ. Ọ bụ ya mere unu ji nọgide na-asị, ‘Ka anyị gaa chụọrọ Onyenwe anyị aja.’

18Laghachinụ azụ ugbu a nʼọrụ unu. A gaghị enye unu okporo ahịhịa ọbụla. Ma unu ga-arụpụtarịrị ọnụọgụgụ brik dị ka a chọrọ nʼaka unu.”

19Ndịisi ọrụ ụmụ Izrel ghọtara na ha nọ na nsogbu mgbe a gwara ha okwu sị ha, “Unu ga-akpụtarịrị ọnụọgụgụ brik unu kwesiri ịkpụ kwa ụbọchị.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.