Ọpụpụ 5

Laghachinụ azụ ugbu a nʼọrụ unu. A gaghị enye unu okporo ahịhịa ọbụla. Ma unu ga-arụpụtarịrị ọnụọgụgụ brik dị ka a chọrọ nʼaka unu.”

Exodus 5:18 (UKJV) Go therefore now, and work; for there shall no straw be given you, yet shall all of you deliver the tale of bricks.

16Ọ dịghị okporo ahịhịa a na-enye ndị ohu gị, ma ha na-asị anyị, ‘Kpụọnụ brik!’ A na-etikwa ndị ohu gị ihe, ma ịta ụta ekwesighị ịdịrị anyị kama ịta ụta dịrị ndị gị.”

17Fero zaghachiri ha sị, “Ndị umengwụ! Nʼezie ndị umengwụ ka unu bụ. Ọ bụ ya mere unu ji nọgide na-asị, ‘Ka anyị gaa chụọrọ Onyenwe anyị aja.’

18Laghachinụ azụ ugbu a nʼọrụ unu. A gaghị enye unu okporo ahịhịa ọbụla. Ma unu ga-arụpụtarịrị ọnụọgụgụ brik dị ka a chọrọ nʼaka unu.”

19Ndịisi ọrụ ụmụ Izrel ghọtara na ha nọ na nsogbu mgbe a gwara ha okwu sị ha, “Unu ga-akpụtarịrị ọnụọgụgụ brik unu kwesiri ịkpụ kwa ụbọchị.”

20Mgbe ha si nʼihu Fero pụọ, ha zutere Mosis na Erọn ebe ha nọ na-eche ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.