Ọpụpụ 5

Mgbe ha si nʼihu Fero pụọ, ha zutere Mosis na Erọn ebe ha nọ na-eche ha.

Exodus 5:20 (UKJV) And they met Moses and Aaron, who stood in the way, as they came forth from Pharaoh:

18Laghachinụ azụ ugbu a nʼọrụ unu. A gaghị enye unu okporo ahịhịa ọbụla. Ma unu ga-arụpụtarịrị ọnụọgụgụ brik dị ka a chọrọ nʼaka unu.”

19Ndịisi ọrụ ụmụ Izrel ghọtara na ha nọ na nsogbu mgbe a gwara ha okwu sị ha, “Unu ga-akpụtarịrị ọnụọgụgụ brik unu kwesiri ịkpụ kwa ụbọchị.”

20Mgbe ha si nʼihu Fero pụọ, ha zutere Mosis na Erọn ebe ha nọ na-eche ha.

21Ndị nlekọta ọrụ ndị a gwara Mosis na Erọn okwu sị, “Ka Onyenwe anyị lee unu anya ma kpee unu ikpe. Unu emeela ka anyị bụrụ ihe na-esi ajọ isi nʼihu Fero na ndị na-ejere ya ozi. Unu etinyela mma agha nʼaka ha nke ha ga-eji gbuo anyị.”

22Mgbe ahụ Mosis laghachikwuru Onyenwe anyị jụọ ya sị, “Onyenwe anyị, gịnị mere i ji butere ndị a nsogbu? Gịnị mere i ji zite m?

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.