20Mgbe ha si nʼihu Fero pụọ, ha zutere Mosis na Erọn ebe ha nọ na-eche ha.
21Ndị nlekọta ọrụ ndị a gwara Mosis na Erọn okwu sị, “Ka Onyenwe anyị lee unu anya ma kpee unu ikpe. Unu emeela ka anyị bụrụ ihe na-esi ajọ isi nʼihu Fero na ndị na-ejere ya ozi. Unu etinyela mma agha nʼaka ha nke ha ga-eji gbuo anyị.”
22Mgbe ahụ Mosis laghachikwuru Onyenwe anyị jụọ ya sị, “Onyenwe anyị, gịnị mere i ji butere ndị a nsogbu? Gịnị mere i ji zite m?
23Nʼihi na site na mgbe m jekwuuru Fero gwa ya okwu nʼaha gị, o meela ka nsogbu dakwasị ndị a, ma ị napụtabeghị ndị gị.”