4Eze Ijipt zara ha sị, “Mosis na Erọn, gịnị mere unu ji na-ewepụ ụmụ Izrel aka site nʼọrụ ha? Laghachinụ nʼọrụ unu!”
5Fero gara nʼihu sị, “Lee, ka ndị obodo a si dị ọtụtụ ugbu a, ihe unu na-eme bụ naanị igbochi ha ịrụ ọrụ ha.”
6Nʼụbọchị ahụ kwa, Fero nyere ndị nlekọta ụmụ Izrel na ndị o mere ndịisi nʼebe ụmụ Izrel nọ iwu sị,
7“Unu enyekwala ụmụ Izrel ahịhịa ha ga-eji kpụọ brik dịka unu na-eme nʼoge gara aga. Kama, ha ga-achọta ahịhịa ahụ nʼonwe ha.
8Ọzọ, meenụ ka ọnụọgụgụ brik ha na-akpụ dịrị ka ọ dị na mbụ, unu emela ka ọ dịrị ala. Ha bụ ndị umengwụ. Ọ bụ ya mere ha ji na-eti mkpu, ‘Ka anyị gaa nʼọzara gaa chụọrọ Chineke anyị aja.’