18Ụmụ ndị ikom Kohat bụ, Amram, Izha, Hebrọn na Uziel. Kohat gbara narị afọ na iri afọ atọ na atọ mgbe ọ nwụrụ.
19Ụmụ ndị ikom Merari bụ Mahali na Mushi. Ndị a niile si nʼagbụrụ Livayị, dịka ihe e dere banyere ha si dị.
20Amram lụrụ Jokebed, nwanne nna ya. Erọn na Mosis bụ ụmụ ha ndị ikom. Ma Amram gbara narị afọ na iri afọ atọ na asaa mgbe ọ nwụrụ.
21Ụmụ ndị ikom Izha bụ Kora, Nefeg na Zikri.
22Ụmụ ndị ikom Uziel bụ, Mishael, Elzafan na Sitri.