20Amram lụrụ Jokebed, nwanne nna ya. Erọn na Mosis bụ ụmụ ha ndị ikom. Ma Amram gbara narị afọ na iri afọ atọ na asaa mgbe ọ nwụrụ.
21Ụmụ ndị ikom Izha bụ Kora, Nefeg na Zikri.
22Ụmụ ndị ikom Uziel bụ, Mishael, Elzafan na Sitri.
23Erọn lụrụ Elisheba, nwa Aminadab, na nwanne nwanyị Nashọn. Ụmụ ha bụ, Nadab, na Abihu, Elieza na Itama.
24Ụmụ ndị ikom Kora bụ, Asịa, Elkena na Abiasaf. Ndị a bụ ndị ikwu Kora.