21Ụmụ ndị ikom Izha bụ Kora, Nefeg na Zikri.
22Ụmụ ndị ikom Uziel bụ, Mishael, Elzafan na Sitri.
23Erọn lụrụ Elisheba, nwa Aminadab, na nwanne nwanyị Nashọn. Ụmụ ha bụ, Nadab, na Abihu, Elieza na Itama.
24Ụmụ ndị ikom Kora bụ, Asịa, Elkena na Abiasaf. Ndị a bụ ndị ikwu Kora.
25Elieza, nwa Erọn lụrụ otu nʼime ụmụ Putiel, onye mụtaara ya Finehaz. Ndị a bụ aha ndịisi ezinaụlọ Livayị dịka ikwu ha si dị.