1Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis sị, “Jekwuru Fero gwa ya, ‘Nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru. Hapụ ndị m, ka ha gaa fee m ofufe.
2Ọ bụrụ na ị jụ ịhapụ ha ka ha gaa, aga m eme ka awọ jupụta nʼala Ijipt niile.
3Osimiri Naịl ga-ejupụta nʼawọ. Ha ga-abata nʼụlọeze gị na nʼime ọnụụlọ ndina gị, ma nʼelu ihe ndina gị, ma nʼụlọ ndị na-ejere gị ozi, ma nʼụlọ ndị gị niile, na nʼebe a na-esi nri, ma nʼime ihe e ji agwakọta ụtụ ọka.