8Fero kpọrọ Mosis na Erọn rịọọ ha sị, “Rịọọnụ Onyenwe anyị ka o wepụrụ mụ na ndị m awọ ndị a. Emesịa aga m ekwe ka ndị gị gaa chụọrọ Onyenwe anyị aja.”
9Mosis zaghachiri Fero sị, “Gị ka ọ dịrị ịgwa m mgbe m ga-arịọ arịrịọ a nʼisi gị na nʼisi ndị gị, ka e wezuga awọ ndị a site nʼụlọ unu, ma hapụ naanị ndị nọ nʼosimiri Naịl.”
10Mgbe ahụ Fero sịrị Mosis, “Achọrọ m ka i mee ya echi.” Mosis zaghachiri Fero sị, “Ọ dị mma, ka ọ dịrị dịka i kwuru. Mgbe ahụ, ị ga-amata na o nweghị onye dịka Onyenwe anyị Chineke anyị.
11Awọ ndị a niile ga-apụ site nʼebe ị nọ, na site nʼụlọ gị na site nʼụlọ ndị na-ejere gị ozi na site nʼụlọ ndị Ijipt niile. Ọ bụ naanị nʼosimiri Naịl ka ha ga-anọ.”
12Mgbe Mosis na Erọn sitere nʼụlọ Fero pụọ, Mosis kpọkuru Onyenwe anyị ka o wepụ awọ ndị a o mere ka ha bịakwasị Fero.