10Mgbe ahụ Fero sịrị Mosis, “Achọrọ m ka i mee ya echi.” Mosis zaghachiri Fero sị, “Ọ dị mma, ka ọ dịrị dịka i kwuru. Mgbe ahụ, ị ga-amata na o nweghị onye dịka Onyenwe anyị Chineke anyị.
11Awọ ndị a niile ga-apụ site nʼebe ị nọ, na site nʼụlọ gị na site nʼụlọ ndị na-ejere gị ozi na site nʼụlọ ndị Ijipt niile. Ọ bụ naanị nʼosimiri Naịl ka ha ga-anọ.”
12Mgbe Mosis na Erọn sitere nʼụlọ Fero pụọ, Mosis kpọkuru Onyenwe anyị ka o wepụ awọ ndị a o mere ka ha bịakwasị Fero.
13Onyenwe anyị mere ihe Mosis rịọrọ. Awọ ndị ahụ niile nwụrụ nʼime ụlọ, na nʼama, na nʼọhịa.
14E kpokọtara ozu awọ ndị a niile nʼebe dị iche iche. Isi ọjọọ ha wetara nʼala ahụ dị egwu.