Ọpụpụ 8

E kpokọtara ozu awọ ndị a niile nʼebe dị iche iche. Isi ọjọọ ha wetara nʼala ahụ dị egwu.

Exodus 8:14 (UKJV) And they gathered them together upon heaps: and the land stank.

12Mgbe Mosis na Erọn sitere nʼụlọ Fero pụọ, Mosis kpọkuru Onyenwe anyị ka o wepụ awọ ndị a o mere ka ha bịakwasị Fero.

13Onyenwe anyị mere ihe Mosis rịọrọ. Awọ ndị ahụ niile nwụrụ nʼime ụlọ, na nʼama, na nʼọhịa.

14E kpokọtara ozu awọ ndị a niile nʼebe dị iche iche. Isi ọjọọ ha wetara nʼala ahụ dị egwu.

15Ma mgbe Fero hụrụ na awọ ndị a anwụchaala, o mechiri obi ya jụ ige Mosis na Erọn ntị, dịka Onyenwe anyị kwuru na ọ ga-eme.

16Ya mere, Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya, “Gwa Erọn, setịpụ mkpanaka gị, tie nʼaja nke ala nʼala Ijipt niile, aja ya ga-aghọ anwụ nta nke na-ata ata.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.