Ọpụpụ 8

Mgbe ihe ndị a na-eme, Fero kpọrọ Mosis na Erọn gwa ha okwu sị, “Gaanụ chụọrọ Chineke unu aja, ma ka ọ bụrụ nʼala Ijipt.”

Exodus 8:25 (UKJV) And Pharaoh called for Moses and for Aaron, and said, Go all of you, sacrifice to your God in the land.

23Aga m emekwa ka ọ pụta ìhè na o nwere ihe dị iche nʼetiti ndị m na ndị gị. Ihe ịrịbama a ga-emezukwa echi.’ ”

24Nʼechi ya, Onyenwe anyị mere dịka o kwuru. Igwe ijiji dị egwu nʼọnụọgụgụ bịara nʼala Ijipt, jupụta nʼụlọ Fero, na nʼụlọ ndị niile na-ejere ya ozi, na nʼala Ijipt niile. E mere ka ala Ijipt bụrụ ihe e ji ijiji mebie.

25Mgbe ihe ndị a na-eme, Fero kpọrọ Mosis na Erọn gwa ha okwu sị, “Gaanụ chụọrọ Chineke unu aja, ma ka ọ bụrụ nʼala Ijipt.”

26Mosis zaghachiri Fero sị, “Nke ahụ abụghị ihe ziri ezi, nʼihi na aja anyị na-aga ịchụrụ Onyenwe anyị Chineke anyị bụ ihe rụrụ arụ nʼanya ndị Ijipt. Ọ bụrụ na anyị achụọ aja a nʼihu ha, ha ga-eji nkume tugbuo anyị.

27Anyị ga-aga njem ụbọchị atọ nʼime ọzara gaa chụọrọ Onyenwe anyị Chineke anyị aja, dịka o nyere anyị iwu ka anyị mee.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.