28Fero zaghachiri ha sị, “Aga m ekwenye ka unu ga chụọrọ Onyenwe anyị Chineke unu aja nʼọzara, ma unu agaghị aga ebe dị anya. Ugbu a, kperenụ m ekpere.”
29Mosis zara Fero sị ya, “Ngwangwa m si nʼihu gị pụọ, aga m arịọ Onyenwe anyị arịrịọ. Echi, a ga-esite nʼụlọ Fero, na nʼụlọ ndị na-ejere ya ozi, na nʼụlọ ndị Ijipt niile wezuga ijiji ndị a. Ọ ga-adị mkpa na Fero ga-elezi anya hapụ ịghọ aghụghọ ọzọ site ịjụ ka ụmụ Izrel gaa chụọrọ Onyenwe anyị aja.”
30Mgbe ahụ, Mosis sitere nʼihu Fero pụọ rịọọ Onyenwe anyị ka o mee ka ijiji ndị a gabiga.
31Onyenwe anyị mere dịka Mosis rịọrọ. Ijiji ndị a sitere nʼụlọ Fero na ụlọ ndị na-ejere ya ozi na ụlọ ndị Ijipt niile pụọ. O nwekwaghị ijiji ọ bụla fọdụrụ nʼala ahụ.
32Ma nʼoge a, Fero gara nʼihu ime ka obi ya sie ike. O kweghị ka ụmụ Izrel laa.