1Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya, “Jekwuru Fero sị ya. ‘Nke a bụ ihe Onyenwe anyị Chineke ndị Hibru kwuru, “Hapụ ndị m ka ha gaa fee m.”
2Ọ bụrụ na ị jụ, ma gaa nʼihu igbochi ha,
3aka Onyenwe anyị ga-ewebata oke ọrịa na-efe efe nke ga-abịakwasị igwe anụ ụlọ unu niile dị nʼubi. Ya bụ, ịnyịnya unu, na ịnyịnya ibu unu, na ịnyịnya kamel unu, na ehi unu, na atụrụ unu na ewu unu.