Ọpụpụ 9

Mosis na Erọn kpooro ntụ gaa guzo nʼihu Fero. Mgbe Fero nọ na-ele anya Mosis wụliri ntụ ahụ elu. Ọ ghọrọ etuto, nke gbawara ghọọ ọnya nʼahụ ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ niile.

Exodus 9:10 (UKJV) And they took ashes of the furnace, and stood before Pharaoh; and Moses sprinkled it up toward heaven; and it became a boil breaking forth with blains upon man, and upon beast.

8Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn sị, “Sitenụ nʼekwu e ji esi nri kporo ntụ nke Mosis ga-awụli elu nʼihu Fero.

9Ntụ ahụ ga-efesasị, dịka uzuzu nʼala Ijipt niile. Ọ ga-ebute etuto nke ga-aghọ ọnya nʼahụ ndị mmadụ na ụmụ anụmanụ dị iche iche dị nʼala ahụ niile.”

10Mosis na Erọn kpooro ntụ gaa guzo nʼihu Fero. Mgbe Fero nọ na-ele anya Mosis wụliri ntụ ahụ elu. Ọ ghọrọ etuto, nke gbawara ghọọ ọnya nʼahụ ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ niile.

11Ndị majiki Ijipt enweghị ike iguzo nʼihu Mosis, nʼihi etuto ndị jupụtara ha nʼahụ dịka ọ dị nʼahụ ndị Ijipt ndị ọzọ.

12Ma Onyenwe anyị mere ka obi Fero sie ike. Ọ jụrụ ige Mosis na Erọn ntị dịka Onyenwe anyị gwara Mosis na ọ ga-eme.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.