Ọpụpụ 9

Ma Onyenwe anyị mere ka obi Fero sie ike. Ọ jụrụ ige Mosis na Erọn ntị dịka Onyenwe anyị gwara Mosis na ọ ga-eme.

Exodus 9:12 (UKJV) And the LORD hardened the heart of Pharaoh, and he hearkened not unto them; as the LORD had spoken unto Moses.

10Mosis na Erọn kpooro ntụ gaa guzo nʼihu Fero. Mgbe Fero nọ na-ele anya Mosis wụliri ntụ ahụ elu. Ọ ghọrọ etuto, nke gbawara ghọọ ọnya nʼahụ ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ niile.

11Ndị majiki Ijipt enweghị ike iguzo nʼihu Mosis, nʼihi etuto ndị jupụtara ha nʼahụ dịka ọ dị nʼahụ ndị Ijipt ndị ọzọ.

12Ma Onyenwe anyị mere ka obi Fero sie ike. Ọ jụrụ ige Mosis na Erọn ntị dịka Onyenwe anyị gwara Mosis na ọ ga-eme.

13Onyenwe anyị gwara Mosis ọzọ sị, “Bilie nʼisi ụtụtụ echi gaa gwa Fero okwu sị ya, ‘Nke a bụ ihe Onyenwe anyị Chineke ndị Hibru kwuru, Hapụ ndị m ka ha gaa fee m ofufe.

14Ma ọ bụghị ya, nʼoge a, aga m ezite ọrịa ọjọọ niile nke na-efe efe, ka ha bịakwasị gị, na ndị na-ejere gị ozi, na ndị Ijipt niile. Nke a ga-eme ka unu ghọta na ọ dịghị Onye ọzọ dịka m nʼelu ụwa niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.