11Ndị majiki Ijipt enweghị ike iguzo nʼihu Mosis, nʼihi etuto ndị jupụtara ha nʼahụ dịka ọ dị nʼahụ ndị Ijipt ndị ọzọ.
12Ma Onyenwe anyị mere ka obi Fero sie ike. Ọ jụrụ ige Mosis na Erọn ntị dịka Onyenwe anyị gwara Mosis na ọ ga-eme.
13Onyenwe anyị gwara Mosis ọzọ sị, “Bilie nʼisi ụtụtụ echi gaa gwa Fero okwu sị ya, ‘Nke a bụ ihe Onyenwe anyị Chineke ndị Hibru kwuru, Hapụ ndị m ka ha gaa fee m ofufe.
14Ma ọ bụghị ya, nʼoge a, aga m ezite ọrịa ọjọọ niile nke na-efe efe, ka ha bịakwasị gị, na ndị na-ejere gị ozi, na ndị Ijipt niile. Nke a ga-eme ka unu ghọta na ọ dịghị Onye ọzọ dịka m nʼelu ụwa niile.
15Nʼihi na tupu oge a, agaara m esetipụ aka m, jiri ajọ ọrịa tie gị na ndị gị niile nke ga-egbuchapụ unu site nʼelu ụwa.