14Ma ọ bụghị ya, nʼoge a, aga m ezite ọrịa ọjọọ niile nke na-efe efe, ka ha bịakwasị gị, na ndị na-ejere gị ozi, na ndị Ijipt niile. Nke a ga-eme ka unu ghọta na ọ dịghị Onye ọzọ dịka m nʼelu ụwa niile.
15Nʼihi na tupu oge a, agaara m esetipụ aka m, jiri ajọ ọrịa tie gị na ndị gị niile nke ga-egbuchapụ unu site nʼelu ụwa.
16Ma ọ bụ nʼihi nke a ka m ji guzobe gị, ka m gosipụta ike m nʼebe ịnọ, ka e nwe ike kwusaa aha m nʼụwa niile.
17Ma ị nọ na-ebuli onwe gị elu megide ndị m, jụ na ha agaghị ala.
18Ya mere, nʼoge dịka oge a echi, aga m ezipu oke ifufe nke ya na akụmmiri igwe so nʼala Ijipt niile. Ụdị ifufe a adịbeghị mbụ nʼala Ijipt, malite nʼoge a tọrọ ntọala ya rute ugbu a.