18Ya mere, nʼoge dịka oge a echi, aga m ezipu oke ifufe nke ya na akụmmiri igwe so nʼala Ijipt niile. Ụdị ifufe a adịbeghị mbụ nʼala Ijipt, malite nʼoge a tọrọ ntọala ya rute ugbu a.
19Ya mere, nye iwu ka a gaa ngwangwa nʼubi unu webata anụ ụlọ unu na ihe ndị ọzọ unu nwere nʼebe a ga-echebe ha, nʼihi na oke ifufe nke ya na mkpụrụ mmiri so ga-egbu mmadụ na anụ ụlọ ọbụla a hapụrụ nʼezi.’ ”
20Ụfọdụ ndị na-ejere Fero ozi, ndị na-atụ okwu Onyenwe anyị egwu mere ngwangwa gaa dulata anụ ụlọ ha, na ndị ohu ha.
21Ma ndị ahụ na-enweghị nrube isi nye okwu Onyenwe anyị hapụrụ ndị ohu ha nakwa anụ ụlọ ha nʼọhịa.
22Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis, “Setịpụ aka gị nʼeluigwe. Nke a ga-eme ifufe nke ya na mkpụrụ mmiri so malite izokwasị ala Ijipt niile, na ụmụ mmadụ, na anụmanụ, na ihe niile a kụrụ nʼubi nʼIjipt.”