Ọpụpụ 9

Onyenwe anyị ga-akpa oke nʼetiti anụ ụlọ ndị Ijipt na nke ndị Izrel. Nʼihi ya, o nweghị anụ ụlọ ọbụla si nʼetiti anụ ụlọ ndị Izrel ga-anwụ.’ ”

Exodus 9:4 (UKJV) And the LORD shall sever between the cattle of Israel and the cattle of Egypt: and there shall nothing die of all that is the children's of Israel.

2Ọ bụrụ na ị jụ, ma gaa nʼihu igbochi ha,

3aka Onyenwe anyị ga-ewebata oke ọrịa na-efe efe nke ga-abịakwasị igwe anụ ụlọ unu niile dị nʼubi. Ya bụ, ịnyịnya unu, na ịnyịnya ibu unu, na ịnyịnya kamel unu, na ehi unu, na atụrụ unu na ewu unu.

4Onyenwe anyị ga-akpa oke nʼetiti anụ ụlọ ndị Ijipt na nke ndị Izrel. Nʼihi ya, o nweghị anụ ụlọ ọbụla si nʼetiti anụ ụlọ ndị Izrel ga-anwụ.’ ”

5Onyenwe anyị ekwuola oge nke a ga-amalite sị, “Echi ka Onyenwe anyị ga-eme ihe dị otu a nʼala a.”

6Nʼụtụtụ echi ya, Onyenwe anyị mere dịka o kwuru. Igwe anụ ụlọ niile dị nʼIjipt nwụrụ. Ma ọ dịghị otu nʼime anụ ụlọ ụmụ Izrel nwụrụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.