Ọpụpụ 9

Nʼụtụtụ echi ya, Onyenwe anyị mere dịka o kwuru. Igwe anụ ụlọ niile dị nʼIjipt nwụrụ. Ma ọ dịghị otu nʼime anụ ụlọ ụmụ Izrel nwụrụ.

Exodus 9:6 (UKJV) And the LORD did that thing on the next day, and all the cattle of Egypt died: but of the cattle of the children of Israel died not one.

4Onyenwe anyị ga-akpa oke nʼetiti anụ ụlọ ndị Ijipt na nke ndị Izrel. Nʼihi ya, o nweghị anụ ụlọ ọbụla si nʼetiti anụ ụlọ ndị Izrel ga-anwụ.’ ”

5Onyenwe anyị ekwuola oge nke a ga-amalite sị, “Echi ka Onyenwe anyị ga-eme ihe dị otu a nʼala a.”

6Nʼụtụtụ echi ya, Onyenwe anyị mere dịka o kwuru. Igwe anụ ụlọ niile dị nʼIjipt nwụrụ. Ma ọ dịghị otu nʼime anụ ụlọ ụmụ Izrel nwụrụ.

7Mgbe ahụ Fero zipụrụ ndị mmadụ ndị gara chọpụta na o nweghị otu nʼime anụ ụlọ ụmụ Izrel nwụrụ. Ma ọ bụladị mgbe ọ chọpụtara na nke a bụ eziokwu, ọ gbanweghị obi ya, ọ nọgidere jụ ikwe ka ndị Izrel laa.

8Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn sị, “Sitenụ nʼekwu e ji esi nri kporo ntụ nke Mosis ga-awụli elu nʼihu Fero.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.