8Nʼokpuru nku ha, ha nwere aka yiri aka mmadụ nʼakụkụ anọ ha niile. Otu a ka ihu ha na nku anọ dị.
9Nku ha na-emetụ na nke ibe ha. Mgbe ha na-efe, ha na-eche ihu ha nʼotu ụzọ, ha adịghị agha anya ha nʼazụ mgbe ha na-aga.
10Maka oyiyi ihu ha: Ha anọ nwere ihu mmadụ, nʼakụkụ aka nri ha nwere ihu ọdụm, nʼakụkụ aka ekpe ha bụ ihu ehi, onye ọbụla nwekwara ihu ugo.
11Otu ahụ ka ihu ha niile dị. Ha gbasara nku ha nʼelu, nke ọbụla nwere nku abụọ, otu nʼime nku ndị a na-emetụ nku nke ibe ya, ebe abụọ kpuchiri ahụ ha.
12Ha niile gawara nʼihu. Ebe ọbụla mmụọ ahụ gara ka ha na-aga, na-eleghị anya nʼazụ.