Izikiel 1

Ihe ndị ahụ dị ndụ na-efegharị nʼebe a, na-efegharịkwa nʼebe nke ọzọ, dịka mgbe amụma na-egbu.

Ezekiel 1:14 (UKJV) And the living creatures ran and returned as the appearance of a flash of lightning.

12Ha niile gawara nʼihu. Ebe ọbụla mmụọ ahụ gara ka ha na-aga, na-eleghị anya nʼazụ.

13Nʼetiti ihe ndị a dị ndụ, e nwere ihe dịka icheku ọkụ na-enwu enwu, dịkwa ka ọwa na-enwu ọkụ. Ọkụ na-esi nʼetiti ihe ndị ahụ dị ndụ na-aga ihu na azụ, ọkụ ahụ nwupụrụ enwupụ, amụma eluigwe sikwa na ya egbupụta.

14Ihe ndị ahụ dị ndụ na-efegharị nʼebe a, na-efegharịkwa nʼebe nke ọzọ, dịka mgbe amụma na-egbu.

15Mgbe m na-ele ihe e kere eke dị ndụ ndị a anya, ahụrụ m ụkwụ ụgbọ agha anọ nke dị nʼala nʼokpuru ha. Onye ọbụla nwere nke ya.

16Ụkwụ ụgbọala ahụ niile dị ka ihe e ji nkume na-egbu maramara a na-akpọ beril kpụọ. Nke ọbụla nʼime ha anọ yikwara ibe ya. Ha niile dịkwa ka wịịlu a kpụrụ tinye nʼetiti ụkwụ ụgbọala buru ibu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.