14Ihe ndị ahụ dị ndụ na-efegharị nʼebe a, na-efegharịkwa nʼebe nke ọzọ, dịka mgbe amụma na-egbu.
15Mgbe m na-ele ihe e kere eke dị ndụ ndị a anya, ahụrụ m ụkwụ ụgbọ agha anọ nke dị nʼala nʼokpuru ha. Onye ọbụla nwere nke ya.
16Ụkwụ ụgbọala ahụ niile dị ka ihe e ji nkume na-egbu maramara a na-akpọ beril kpụọ. Nke ọbụla nʼime ha anọ yikwara ibe ya. Ha niile dịkwa ka wịịlu a kpụrụ tinye nʼetiti ụkwụ ụgbọala buru ibu.
17Mgbe ha pụrụ, ha na-aga nʼakụkụ anọ nke ha chere ihu ha, ma ụkwụ ụgbọ agha ahụ adịghị echigharị echigharị mgbe ha na-aga.
18Azụ ụkwụ ụgbọ agha ha dị elu, dịkwa egwu. Anya jupụtakwara nʼazụ ụkwụ ụgbọ agha ndị ahụ.