19Mgbe ihe ndị a dị ndụ fepụrụ gaa nʼihu, ụkwụ ụgbọala ndị ahụ dị nʼakụkụ ha na-eso ha. Mgbe ha feliri elu, ụkwụ ndị ahụ na-esokwa.
20Ebe ọbụla mmụọ ha jere, ebe ahụ ka ha na-aga, ụkwụ ụgbọ agha ahụ na-esokwa ha, nʼihi na mmụọ nke anụ ndị ahụ dị ndụ dị nʼụkwụ ụgbọ agha ndị ahụ.
21Mgbe ha biliri, ndị ọzọ na-ebilikwa. Mgbe ha guzoro otu ebe, ndị ọzọ na-eguzokwa. Mgbe ha feliri elu, ụkwụ ụgbọala ahụ na-eso ha. Nʼihi na mmụọ anụ ndị ahụ dị ndụ dị nʼime ụkwụ ụgbọ agha ndị ahụ.
22A tụsara ihe sara mbara dịka mbara eluigwe nʼelu isi ihe ndị ahụ dị ndụ. Ọ na-eyi egwu, ma na-egbukwa nweghenweghe dịka kristal.
23Nʼokpuru ihe ahụ ka ha gbasapụrụ nku ha, ka ọ na-emetụ nke ibe ya. Ha niile nʼotu nʼotu nwere nku abụọ nke na-ekpuchi ahụ ya.