Izikiel 1

A tụsara ihe sara mbara dịka mbara eluigwe nʼelu isi ihe ndị ahụ dị ndụ. Ọ na-eyi egwu, ma na-egbukwa nweghenweghe dịka kristal.

Ezekiel 1:22 (UKJV) And the likeness of the firmament upon the heads of the living creature was as the colour of the terrible crystal, stretched forth over their heads above.

20Ebe ọbụla mmụọ ha jere, ebe ahụ ka ha na-aga, ụkwụ ụgbọ agha ahụ na-esokwa ha, nʼihi na mmụọ nke anụ ndị ahụ dị ndụ dị nʼụkwụ ụgbọ agha ndị ahụ.

21Mgbe ha biliri, ndị ọzọ na-ebilikwa. Mgbe ha guzoro otu ebe, ndị ọzọ na-eguzokwa. Mgbe ha feliri elu, ụkwụ ụgbọala ahụ na-eso ha. Nʼihi na mmụọ anụ ndị ahụ dị ndụ dị nʼime ụkwụ ụgbọ agha ndị ahụ.

22A tụsara ihe sara mbara dịka mbara eluigwe nʼelu isi ihe ndị ahụ dị ndụ. Ọ na-eyi egwu, ma na-egbukwa nweghenweghe dịka kristal.

23Nʼokpuru ihe ahụ ka ha gbasapụrụ nku ha, ka ọ na-emetụ nke ibe ya. Ha niile nʼotu nʼotu nwere nku abụọ nke na-ekpuchi ahụ ya.

24Mgbe ha na-aga, nku ha na-eme mkpọtụ dị ka mkpọtụ ebili mmiri na-amagharị amagharị. Mkpọtụ ahụ dịkwa ka ịda ụda nke olu Onye pụrụ ime ihe niile, ka olu iti mkpu nke usuu ndị agha. Mgbe ọbụla ha guzoro, ha na-achịtu nku ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.