4Elere m anya hụ oke ifufe nke si nʼugwu na-abịa, ahụkwara m oke igwe ojii na amụma nke na-egbuke egbuke; ìhè nke na-enwu nnọọ vaa gbara ya gburugburu. Etiti ọkụ ahụ nwere ihe dịka ọlaọkụ na-amụke amụke.
5Ihe e kere eke anọ dị ndụ, nke yiri mmadụ nʼụdịdị ha, nọkwa nʼetiti oke ihe ahụ.
6Nke ọbụla nʼime ha nwere ihu anọ, na nku anọ.
7Ụkwụ ha guzoro kwem; ọbụ ụkwụ ha dịka nke nwa ehi, na-amụkekwa dịka bronz e hichara nke ọma.
8Nʼokpuru nku ha, ha nwere aka yiri aka mmadụ nʼakụkụ anọ ha niile. Otu a ka ihu ha na nku anọ dị.