5Ihe e kere eke anọ dị ndụ, nke yiri mmadụ nʼụdịdị ha, nọkwa nʼetiti oke ihe ahụ.
6Nke ọbụla nʼime ha nwere ihu anọ, na nku anọ.
7Ụkwụ ha guzoro kwem; ọbụ ụkwụ ha dịka nke nwa ehi, na-amụkekwa dịka bronz e hichara nke ọma.
8Nʼokpuru nku ha, ha nwere aka yiri aka mmadụ nʼakụkụ anọ ha niile. Otu a ka ihu ha na nku anọ dị.
9Nku ha na-emetụ na nke ibe ha. Mgbe ha na-efe, ha na-eche ihu ha nʼotu ụzọ, ha adịghị agha anya ha nʼazụ mgbe ha na-aga.