Izikiel 10

Mgbe ahụ, elere m anya hụ ocheeze ọma e ji nkume safaia wuo ka ọ pụtara ihe na mbara eluigwe, nʼelu ebe ahụ isi cherubim ndị ahụ dị.

Ezekiel 10:1 (UKJV) Then I looked, and, behold, in the firmament that was above the head of the cherubims there appeared over them as it were a sapphire stone, as the appearance of the likeness of a throne.

1Mgbe ahụ, elere m anya hụ ocheeze ọma e ji nkume safaia wuo ka ọ pụtara ihe na mbara eluigwe, nʼelu ebe ahụ isi cherubim ndị ahụ dị.

2Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị nwoke ahụ yi uwe akwa ọcha, “Baa nʼetiti ụkwụ ụgbọala ahụ dị nʼokpuru cherubim ndị ahụ. Site nʼetiti cherubim ndị ahụ kpojuo icheku ọkụ nke na-ere ere nʼaka gị, fesachaa ha nʼime obodo ahụ niile.” Ọ bara nʼime ka m nʼele ya anya.

3Cherubim ndị ahụ na-eguzo nʼakụkụ ndịda nke ụlọnsọ ahụ mgbe nwoke ahụ banyere. Igwe ojii jupụtakwara nʼogige ime ụlọnsọ ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.