Izikiel 10

Gburugburu ha, nʼanụ ahụ ha niile, ma nʼazụ ha, ma nʼaka ha, ma na nku ha, ma na wịịlu ndị ahụ, ihe jupụtara ha bụ anya. Anya dị nʼakụkụ ha niile.

Ezekiel 10:12 (UKJV) And their whole body, and their backs, and their hands, and their wings, and the wheels, were full of eyes round about, even the wheels that they four had.

10Wịịlu anọ ndị ahụ yiri onwe ha. Nke ọbụla nʼime ha dịka wịịlu a rụnyere nʼetiti wịịlu ọzọ.

11Mgbe ha na-aga, ha niile na-eche ihu nʼakụkụ ọbụla nke cherubim ndị ahụ chere ihu. Wịịlu ndị a adịghị echigharị echigharị mgbe cherubim ndị a na-agagharị. Kama ebe isi cherubim ndị ahụ chere ihu ka wịịlu ndị ahụ na-aga. Ha adịghị elekwa anya nʼazụ dịka ha na-aga.

12Gburugburu ha, nʼanụ ahụ ha niile, ma nʼazụ ha, ma nʼaka ha, ma na nku ha, ma na wịịlu ndị ahụ, ihe jupụtara ha bụ anya. Anya dị nʼakụkụ ha niile.

13Aha m nụrụ a na-akpọ wịịlu ndị ahụ bụ, Ọgba gburugburu.

14Nke ọbụla nʼime cherubim ndị a nwere ihu anọ. Ihu nke mbụ dịka ihu cherub. Nke abụọ dịka ihu mmadụ; nke atọ dịka ihu ọdụm, ma nke anọ dịka ihu ugo.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.