14Nke ọbụla nʼime cherubim ndị a nwere ihu anọ. Ihu nke mbụ dịka ihu cherub. Nke abụọ dịka ihu mmadụ; nke atọ dịka ihu ọdụm, ma nke anọ dịka ihu ugo.
15Mgbe ahụ, Cherubim ndị ahụ buliri onwe ha elu. Ndị a bụ ihe ndị ahụ dị ndụ nke m hụrụ na mbụ nʼakụkụ osimiri Keba.
16Mgbe cherubim ndị ahụ na-aga, wịịlu ndị ahụ dị nʼakụkụ ha na-eso ha na-aga. Mgbe ha na-achili nku ha i si nʼala bulie onwe ha elu, wịịlu ha na-anọgidekwa nʼakụkụ ha.
17Mgbe cherubim ndị ahụ guzoro nʼotu ebe, wịịlu ahụ na-eguzokwa. Mgbe ha na-ebuli onwe ha elu, wịịlu ndị ahụ na-ebulikwa onwe ha elu, nʼihi na mmụọ nke ihe ahụ dị ndụ dị nʼime ha.
18Emesịa, ebube nke Onyenwe anyị sitere na mbata ọnụ ụzọ ụlọnsọ ahụ pụọ, gaa guzo nʼelu cherubim ndị ahụ.