Izikiel 10

Mgbe ahụ, ebube Onyenwe anyị sitere nʼelu cherubim bilie, bịa guzo nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ ahụ. Ụlọnsọ ahụ jupụtakwara nʼigwe ojii, ihe nke ebube Onyenwe anyị jupụtakwara nʼogige ụlọnsọ ahụ.

Ezekiel 10:4 (UKJV) Then the glory of the LORD went up from the cherub, and stood over the threshold of the house; and the house was filled with the cloud, and the court was full of the brightness of the LORD's glory.

2Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị nwoke ahụ yi uwe akwa ọcha, “Baa nʼetiti ụkwụ ụgbọala ahụ dị nʼokpuru cherubim ndị ahụ. Site nʼetiti cherubim ndị ahụ kpojuo icheku ọkụ nke na-ere ere nʼaka gị, fesachaa ha nʼime obodo ahụ niile.” Ọ bara nʼime ka m nʼele ya anya.

3Cherubim ndị ahụ na-eguzo nʼakụkụ ndịda nke ụlọnsọ ahụ mgbe nwoke ahụ banyere. Igwe ojii jupụtakwara nʼogige ime ụlọnsọ ahụ.

4Mgbe ahụ, ebube Onyenwe anyị sitere nʼelu cherubim bilie, bịa guzo nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ ahụ. Ụlọnsọ ahụ jupụtakwara nʼigwe ojii, ihe nke ebube Onyenwe anyị jupụtakwara nʼogige ụlọnsọ ahụ.

5Ụzụ nke nku cherubim ndị ahụ na-eme dịkwa ka olu Chineke Onye pụrụ ime ihe niile. A na-anụkwa ụzụ nku ndị ahụ nʼogige ụlọnsọ ahụ dị nʼezi.

6Mgbe Onyenwe anyị nyere nwoke ahụ yi uwe ezi akwa ọcha iwu, sị, “Gaa nʼetiti cherubim ahụ gụta ụfọdụ icheku ọkụ dị nʼetiti wịịlu ụgbọala ahụ,” nwoke ahụ banyere guzo nʼakụkụ otu wịịlu ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.