5Ụzụ nke nku cherubim ndị ahụ na-eme dịkwa ka olu Chineke Onye pụrụ ime ihe niile. A na-anụkwa ụzụ nku ndị ahụ nʼogige ụlọnsọ ahụ dị nʼezi.
6Mgbe Onyenwe anyị nyere nwoke ahụ yi uwe ezi akwa ọcha iwu, sị, “Gaa nʼetiti cherubim ahụ gụta ụfọdụ icheku ọkụ dị nʼetiti wịịlu ụgbọala ahụ,” nwoke ahụ banyere guzo nʼakụkụ otu wịịlu ahụ.
7Mgbe ahụ, otu nʼime ndị cherubim ahụ setịpụrụ aka ya nʼebe ọkụ ahụ dị nʼetiti ha. Ọ gụtara ụfọdụ icheku ọkụ tinye nʼaka nwoke ahụ yi uwe akwa ọcha onye weere ya pụọ.
8Nʼokpuru nku ndị cherubim ahụ ka a na-ahụta ihe yiri aka mmadụ.
9Elere m anya hụ wịịlu anọ, nke dị nʼakụkụ cherubim ndị ahụ. Cherubim ọbụla nwere otu wịịlu nʼakụkụ ya. Wịịlu ndị a niile na-egbu maramara dịka nkume beril.