12Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. Nʼihi na unu bụ ndị na-enupu isi site nʼiwu m na ụkpụrụ m. Ma unu na-agbaso nzọ ụkwụ nke mba ndị ahụ niile gbara unu gburugburu.”
13Mgbe m ka nọ na-ebu amụma, Pelataya nwa Benaya nwụrụ. Mụ onwe m kpuo ihu m nʼala kwaa akwa sị, “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ị ga-ebibi ndị niile fọdụrụ nʼala Izrel?”
14Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
15“Nwa nke mmadụ, ụmụ nke nna gị, ọ bụladị ụmụnna gị, na ndị mgbapụta gị na ezinaụlọ Izrel niile, ọ bụ ha ka ndị bi na Jerusalem sịrị, ‘Ha esitela nʼebe Onyenwe anyị nọ gaa ebe dị anya, ọ bụkwa anyị ka enyere ala nke a ka ọ bụrụ ihe nnweta anyị,’
16“Nʼihi nke a, kwuo, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-asị, Nʼagbanyeghị na m zipụrụ ha gaa ebe dị anya nʼetiti mba dị iche iche, chụsakwaa ha nʼetiti ala dị iche iche, ma nwa mgbe nta, a bụụrụ m ha ebe dị nsọ nʼala niile ahụ bụ ebe ha gara.’