14Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
15“Nwa nke mmadụ, ụmụ nke nna gị, ọ bụladị ụmụnna gị, na ndị mgbapụta gị na ezinaụlọ Izrel niile, ọ bụ ha ka ndị bi na Jerusalem sịrị, ‘Ha esitela nʼebe Onyenwe anyị nọ gaa ebe dị anya, ọ bụkwa anyị ka enyere ala nke a ka ọ bụrụ ihe nnweta anyị,’
16“Nʼihi nke a, kwuo, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-asị, Nʼagbanyeghị na m zipụrụ ha gaa ebe dị anya nʼetiti mba dị iche iche, chụsakwaa ha nʼetiti ala dị iche iche, ma nwa mgbe nta, a bụụrụ m ha ebe dị nsọ nʼala niile ahụ bụ ebe ha gara.’
17“Ya mere kwuo, ‘Nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Aga m achịkọtakwa unu ọnụ ọzọ, site nʼobodo niile bụ ebe unu gbasara, nyeghachikwa unu ala Izrel.’
18“Ha ga-alọghachi nʼebe ahụ, sitekwa nʼetiti ya wezuga oyiyi ihe arụ niile, na arụsị niile bụkwa ihe arụ.