21Ma banyere ndị ahụ obi ha na-agbaso ihe ọjọọ na ihe niile rụrụ arụ, mmehie ha ka m ga-atụkwasị nʼisi ha; otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.”
22Mgbe ahụ, cherubim ndị ahụ weliri nku ha elu, wịịlu ndị ahụ dịkwa nʼakụkụ ha ma ebube nke Chineke nke Izrel guzokwa nʼelu ha.
23Ebube Onyenwe anyị sitere nʼetiti obodo ahụ rigoo, guzo nʼelu ugwu, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ.
24Nʼime ọhụ, Mmụọ nke Chineke buliri m elu bubata m na Kaldịa, ebe ndị a dọkpụụrụ gaa mba ọzọ nọ. Otu a ka ọhụ m hụrụ si hapụ m.
25Agwakwara m ndị niile ahụ e mere ka ha jee biri na mba ọzọ ihe niile nke Onyenwe anyị gosiri m.